诗篇 29

耶和华的声音发在水上

Abụ Ọma Devid. Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya. 2Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya. 3Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri.

4Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube. 5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn. 6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ.

7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu. 8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji. 9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!” 10Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.

11Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.

已复制!
Aa