욥기 25

사람이 어찌 의롭다 하랴

Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị: 2“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke; Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe. 3Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ? Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?

4Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha? 5Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta, ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya, 6ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”

복사됨!
Aa